Psalms 113

Abụ otuto

1Toonu Onyenwe anyị!

Toonu Onyenwe anyị unu ndị ohu ya.
Toonu aha Onyenwe anyị.
2Ka aha Onyenwe anyị bụrụ ihe a gọziri agọzi
site ugbu a ruo mgbe ebighị ebi.
3Site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda ya,
aha Onyenwe anyị ga-abụ ihe a na-eto eto.

4 Onyenwe anyị dị elu karịa mba niile,
ebube ya dị elu karịa eluigwe.
5Onye dị ka Onyenwe anyị Chineke anyị,
onye nọkwasịrị ocheeze nʼebe dị elu,
6onye na-eme onwe ya ka ọ dị ala ilekwasị
eluigwe na ụwa anya?

7Ọ na-esi nʼuzuzu bulie ogbenye elu
sitekwa nʼebe ikpofu ahịhịa bulie onye nọ na mkpa elu;
8ọ na-eme ka ya na ụmụ eze ndị ikom nọkọọ,
ọ na-eme ka o soro ndị a maara aha ha nʼetiti ụmụ mmadụ nọkọọ.
9Ọ na-eme ka nwanyị aga biri nʼụlọ nke ya
dịka nne mụrụ ọtụtụ ụmụ ọṅụ juru obi.

Toonu Onyenwe anyị.
Copyright information for IboBIU